Details
The Igbo Radio was founded in 2009 to be an online resource centre for text, audio, video, news, educational and cutlura... The Igbo Radio was founded in 2009 to be an online resource centre for text, audio, video, news, educational and cutlural contents in Igbo language.

Mission
As the first of its kind, we want to remain a pacesetter in using modern technology to promote Igbo language and culture.

Motivation
Igbo, a language of over thirty million native speakers living predominantly in South-Eastern Nigeria, and which, due to immigration, now has a significant native-speaker representation in North America, is categorized as an endangered language due to sociolinguistic factors resulting in decreasing native-speaker competence.

In North America and everywhere else where Igbo is spoken, modern professional families often have neither time nor the knowledge of the oral traditions to transfer to their children. We are stepping in to provide an avenue for the Igbo family to learn language, values, customs, ethics, etc., through media contents.

This collaborative project focuses on preserving the Igbo language, which, according to the UNESCO and endangered language scholars, will be extinct in 50 years. This website is designed to be a Learning Management System, and an online language centre where users from all parts of the world can finds news, audio and video contents for both entertainment and educational purposes.
More
People Who Liked This (1)
Pinned Items
Recent Activities
  • Isita: Obianọ Akpọkuola Ndị Ụka Ka Ha Bie Ndụ Ezi Onye Otu Christ

    Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ndị ụka n'ụwa gbaa gburu gburu ka ha malite ibi ndụ ezi onye otu Christ ma gbakụtakwa ihe ọjọọ azụ. Gọvanọ Obianọ kpọrọ oku a n'okwu ya na mmemme ịchụ aja ofufe dị nsọ...
    Isita: Obianọ Akpọkuola Ndị Ụka Ka Ha Bie Ndụ Ezi Onye Otu Christ

    Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ndị ụka n'ụwa gbaa gburu gburu ka ha malite ibi ndụ ezi onye otu Christ ma gbakụtakwa ihe ọjọọ azụ. Gọvanọ Obianọ kpọrọ oku a n'okwu ya na mmemme ịchụ aja ofufe dị nsọ e jiri merube ụbọchị Isita, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ụka Katọliki St Joseph dị n'Agụleri, bụ obodo ya bụ agụ nwoke.

    Gọvanọ Obianọ jiri ohere ahụ wee sị ndị Anambra "Mmemme Isita Ọma", ma mezie ka ha mara na Christ hụrụ onye ọbụla, wee ruo nke ịnwụ ọnwụ n'elu obe.

    Na ntụnye nke ya, onye ode akwụkwọ ukwu nyegara gọvanọ, bụ Sa Willie Nwokoye kọwara na mmemme Isita nke ahọ ga-ewetara ndị Anambra niile ntọhapụ, mmepe ụzọ nakwa mbuli elu n'ụzọ dị iche iche, ọbụnadị site n'ọchịchị gọvanọ Willie Obianọ.

    Na mbụ n'okwu ya, onye Bishọpụ enyemaka ụka katọliki na Dayọsịsị Onịsha, bụ 'Most Reverend' Dennis Isizọ chetaara ndị ụka na ọ bụ site n'ụzọ nke obe ka mmadụ pụrụ isi wee ruo n'obe, ma kpọkuo ha ka onye ọbụla nọgide n'ụzọ nke Christ, iji wee keta oke n'uru dị ahụhụ ọ hụrụ n'elu obe, na mmeri o meriri nsogbu niile nke ụwa.

    N'aka nke ya, Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka itinyesi akụrụngwa n'okporo ụzọ na idozigharị ụzọ, bụ maazị Marcel Ifejiọfọ kọwara mmemme Isita bụ oge dị oke mpka na ndụ onye ụka ọbụla, ma sịkwa na ọ bụ oge mmadụ kwesiri iji tụgharị uche banyere ahụhụ Christ hụrụ na ọnwụ ọ nwụụrụ ya n'elu obe. Ọ kpọkuzịkwara onye ọbụla ka o were oge isita a wee mee udo n'etiti ya na ibe ya, gosipụta ihụnanya, ma kwalitekwa ọdịmma nke mmadụ ibe ya, ọ kachasị ndị e nweghị ka ọ dị ha.

    Ihe pụtakarịchara ihè na ya bụ ofufe nro dị nsọ, bụ abụ dị iche iche a bụrụ site n'ọnụ ndị ọbụ abụ, tinyere ịtụ mmamma a tụrụ site n'aka ezinaụlọ dịgasị iche iche.

     https://www.igboradio.com/index.php/home/afrika/368-isita-obian-akp-kuola-nd-ka-ka-ha-bie-nd-ezi-onye-otu-christ
    More
    0
    0
    0
    0
    0
    0
    Post is under moderation
    Stream item published successfully. Item will now be visible on your stream.
  •  https://www.igboradio.com/index.php/home/afrika/367-t-t-nd-ntorob-a-ga-erita-uru-n-am-ma-nkwado-g-van-obian

    Dịka otu n'ime ụzọ isi mezupụta nkwa o kwere banyere ihe ọ ga-eme n'ọchịchị ya nke abụọ, aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ amalitela amụmà nkwado na inye nkụzi pụrụ iche...
     https://www.igboradio.com/index.php/home/afrika/367-t-t-nd-ntorob-a-ga-erita-uru-n-am-ma-nkwado-g-van-obian

    Dịka otu n'ime ụzọ isi mezupụta nkwa o kwere banyere ihe ọ ga-eme n'ọchịchị ya nke abụọ, aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ amalitela amụmà nkwado na inye nkụzi pụrụ iche maka ndị ntorobịa, ma bụrụkwa nke a malitere na Nnewi n'isi ngwụcha izu ụka gara aga.

    Ya bụ amụmà nkwado na nkụzi bụ nke a chịkọbara site n'aka onye enyemaka pụrụ gọvanọ n'ihe gbasaara ịmụ ọrụ aka ndị ntorobia n'oge gara aga, bụ maazị Eloka Mmadụekwe, sịte na njikọ aka nke ụlọ ọrụ 'Reality Forum', bụ otu ụlọ nnọrọ onwe a ma ama n'ime ntụnye pụrụ iche na mpaghara Nnewi na obodo ndị ọzọ gbara ya gburu gburu nakwa ịkwalite ezo ọchịchị nke otu ndọrọ ndọrọ APGA na steeti ahụ.

    Ya bụ Ọgbakọ ahụ, nke isi okwu ya bụ: "Ọmụmụ Ọrụ Aka: Ụzọ Kacha Mma Isi Weta Otútó Nke Ọnọdụ Akụnụba" dọtara imirikiti ndị mmadụ dị iche iche, bụ ndị megoro nke ọma dịka ndị ọrụ aka, nakwa ndị na-ewunye ihe mwunye dị iche iche sitere Nnewi, ma bụrụkwa ndị megoro ihe na-ada ụda na nkwalite nke ọnọdụ akụnụba steeti Anambra na ọnụ ego ala Naịjiria.

    Ọtụtụ n'ime ndị a gụnyere maazị Ajụlụ Ụzọdike, bụ onye chọpụtara ụlọ ọrụ ''Cutix Plc.''; dọkịnta Dozie Ikedife, bụ onye ọrụ ahụike na onye nwe ụlọ ọgwụ ''Ikedife Specialist Hospital, Nnewi''; maazị Linus Ilozue, bụ onye isi na ọga kwata kwata nke ụlọ ọrụ "Chicason Group of Companies, Nnewi"; maazị Humphrey Ngọnadị, bụ onyeisi ụlọ ọrụ "Ngonadi Group of Companies", tinyere maazị Pedee Ọfọdeme, bụ onyeisi ụlọ ọrụ "Poncad Integrated Services". Ndị a niile bụkwa ndị a kpachapụrụ anya wee họrọ ka ha wee were ọgụgụ isi na amamihe ha wee metụta ndụ ndị ntorobịa ahụ, bụ ndị chọrọ ịmụ ọrụ aka dị iche iche, nakwa ịmụta otu ha ga-esi chekwaba, kwalite ma hazie obere ụlọ ọrụ ha nwere, ka o wee guzoro n'ogogo dị elu.

    N'okwu mmalite ya na ya bụ ọgbakọ, onye nhazi atụmatụ ahụ, bụ maazị Madụekwe kọwara na ọ bụ mmasị ọchịchị nọ ugbu a na steeti Anambra na atụmatụ nkwado ndị ntorobịa Nnewi ahụ ga-enwetazu na ebumnobi niile nke e kwere chịkọba ya, ma kọwaa na dịka oge na-aga, na a ga-ebukwa ya bụ atụmatụ gazuchaa n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ.

    A ga-echeta na ọ bụ ihe mere eme na mgbe ọ na-achụ nta nkwado ya nke ugboro abụọ, bụ nke o mechaara wee nweta mmeri dara ụda n'okpuru ọchịchị niile e nwere na steeti Anambra, na gọvanọ Obianọ kwere nkwa ịtụpụta na ịbagide n'atụmatụ dị iche iche iji kwalite ọnọdụ na ọdịmma ndị ntorobịa na steeti ahụ.

    N'okwu nke ya, onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi ụlọ ọrụ Reality Forum, bụ maazị Ụzọ Nwosu mere ka ndị ntorobịa ahụ mara na ọ bụrụ na ha mụchaa ọrụ ọbụla ha chọrọ ịmụ, na a ga-enye onye ọbụla n'ime ha ego mgbazinye ga-ezuru ya ịmalite nke ya, bụkwa ego mgbazinye nke ọmụrụnwa ọbụla adịghị n'elu ya.

    Maazị Nwosu, bụ onye chọrọ iji aha otu ndọrọ ndọrọ APGA wee zọọ ọkwa onye nnọchi anya ọgbọ nta nkwado Nnewi Nọọtụ/Sawụtụ/Ekwusigo n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu etiti, mere ka a mara na ebumnobi nke inye nkụzi ọmụmụ na nkwado ọrụ aka ahụ bụ iji mee ka ndị ntorobịa nwee ọrụ aka nke onwe ha, kwụụrụ onwe ha, ma sokwa na-atụnye ụtụ nke ha na nkwalite nke otútó na ọnọdụ akụnụba nke ala anyị. Ọ kọwakwara na nke ahụ ga-enye aka n'ibelata mpụ na arụrụ ala, tinyekwuoro na ọ ga-enyekwa aka n'ikewapụta ọtụtụ ohere ọrụ n'ala anyị.
    More
    0
    0
    0
    0
    0
    0
    Post is under moderation
    Stream item published successfully. Item will now be visible on your stream.
There are no activities here yet
Unable to load tooltip content.

Ochanja.com is a powerful social media platform built for the promotion of the Igbo language and culture. Ochanja.com is just like Facebook, Twitter or LinkedIn, but specifically built as a gathering place for Igbo people and lovers of the Igbo language and culture. You can post or read news and current affairs. You can follow people and add them as friends. You can build pages for your personal profile, organization or business. You can like people's pages and they can like yours too. You can engage in live chatting with your family and friends. You can share your photos and videos with your family and friends. You can build both private and public groups to engage your members. You can make your posts private or public – you decide who should view your posts. IT IS ALL FREE OF CHARGE! Please sign up today, join the action, begin to connect with friends and family, invite your friends and families over, and share your experiences (photos, videos, etc.,) with people in your world.

We encourage you to use the Igbo language on this platform, but while on Ochanja.com, feel free to interact with your friends in any language of your choice.

All we are asking for is that we all respect one another as we use this very powerful communications tool to meet our needs of staying connected with our fellow Ndi Igbo and Igbo lovers.

Asusu na omenaala Igbo ga-adigide! Ho ha!